Etu m siri bụrụ nwunye Zebrudaya n'ejije ochie 'New Masquerade' - Lizzy Evoeme

Etu m siri bụrụ nwunye Zebrudaya n'ejije ochie 'New Masquerade' - Lizzy Evoeme

Lizzy Evoeme bụ onye kpara agwa dịka Ovularia n'ejije "New Masquerade" nke wuru ewu na TV malite na ngwụcha ebe afọ 1980 ruo etiti ebe afọ 1990.

N'ejije ahụ, Ovularia bụ nwunye Zebrudaya, nke onye ejije a ma ama bụ Chika Okpara kpara agwa ya.

Na mkparịtaụka a, Lizzy Evoeme gwara anyị na ọ bụghị ya bụ onye mbụ kpara agwa dịka Ovularia, mana ọ bụ ya bụ onye a kacha mara n'ihi ya.

Etu Lizzy Evoeme si banye ime ejije

Ndị so mee ejije 'New Masqurade

Ebe foto si, NTA

Nkọwa foto, Ndị so mee ejije 'New Masqurade

Lizzy Evoeme kwuru na ya bụ onye Akabo dị n'okpuru ọchịchị Mbaitoli, Imo Steeti, mana di ya bụ onye Ngwa, Abia Steeti.

O kwuru na ọ malitere na nwata gosipụtawa na ya nwere onyinye ọnatarachi ime ejije.

"Ma n'ụlọakwụkwọ, ma n'ụlọụka, oge ọbụla ihe ejije pụtara, ana m anọ ya," Lizzy kwuru.

"Enwere oge ndị otu 'Masquerade' si Enugu bịa Aba, ozi wee gbasaa na ha na-achọ onye ga-akpa agwa dịka Ovularia nwunye Zebrudaya, e wee kpọta aha m."

"Oge m bịaruru ebe ahụ, e nye m akwụkwọ ka m gụọ, m gụọ ya, ha sị na m gụtara ya nke ọma. Ọ bụ otu a ka m si malite."

Asịrị gbasara ọnwụ Lizzy Evoeme

N'etiti afọ 2021, akụkọ fesara na Lizzy Evoeme anwụọla, mana akụkọ ahụ bụ akụkọ ụgha.

Lizzy n'onwe ya gwara BBC Igbo na ya nọ n'ime ụlọ ya oge ụfọdụ ụmụụmụ ya bịara na-ajụ ya ma ahụ ọ dịkwa ya.

"Agwara m ha na onweghị ihe na-eme m, na ahụ siri m ike."

"Dịka anyị na-ekwu okwu, ọtụtụ ndị mmadụ malitere ịkpọ ekwentị m, na-ajụ m ebe m nọ nakwa etu ahụ m dị."

"Ọ bụ etu ahụ ka m sị nụ asịrị ahụ na-efegharị na ha anwụọla, ọ bụghị m."

"Adị m afọ 80 n'ụma ugbua, ụmụ m amụọla ụmụ, ụmụ ha amụtakwa ụmụ."

"Ọ bụ Ngọzị Chineke. Enwekwara m olile anya na Chineke ga-edebe m ndụ na-aga n'ihu."

Mmekọrịta Lizzy na ndị otu ejije Masquerade ndị ọzọ

Ichie Chika Okpara - Zebrudaya

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ichie Chika Okpara - Zebrudaya

Ọtụtụ n'ime ndị so n'ejije 'New Masquerade' alaala mmụọ ugbua.

Ha gụnyere Romanus Amuta (Naatị), James Iroha (Giringori), Christy Essien Igbokwe (Akpenọ), na Claude Eke (Jegede Sokoya).

Mana Lizzy Ovoeme kwuru na ya na Zebrudaya ka na-akparịta nke ọma.

"Mụ na Zebrudaya na-ekwu nke ọma n'ekwentị. Ọ na-akpọ m ugboro ugboro."

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Vining Ogu.