Pericoma Okoye: Ihe mere odogwu Izuọgụ ji anyị ajọ arọ

  • Uche Akolisa
  • BBC Igbo, Lagos
Pericoma Okoye

Ebe foto si, Omor Perry

Nkọwa foto, Pericoma Okoye bụ otiegwu Igbo e ji ọdịnala mara

Na nsonso a, aha otiegwu Ichie Pericoma Azubuike Okoye, bidoro ịkpọtụ akpọtụ na soshal midia.

Onye metere agụ Afrịka nọ n'ụra kemgbe afọ 2017 oge ọ lara mmụọ?

Ọ bụ otu ụkọchụkwụ Chukwuemeka Ohanaemere ama ama dịka 'Odumeje' nke Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry dị n'Ọnicha, Anambara steeti.

Odumeje 'kwuru okwu ọjọọ maka odogwu Izuọgụ n'ihe onyonyo fegharịrị n'ịntanetị na nsonso a nke butere ụka.

Ụfọdụ ji ihe onyonyo ahụ nke kọkwara ndị Arọndịizuọgụ ọnụ ịbụ ogbenye, mere ihe ọchị.

Mana ya bụ okwu akụkụ atọghị ndị Arọndiizuọgụ na ndị ihe Pericoma na-amasị gụnyere ọkpara Pericoma Okoye bụ Omor Perry na onye bụbu onyeisi Massob bụ Ralph Uwazuruike, ọchị.

Uwazuruike, onye katọrọ ihe Odumeje kwuru sị na "o wutere m na ala Igbo anaghị eji onye nwụrụ anwụ eme mkparị."

Omor Perry na onwe ya mara Odumeje aka sị ya pụta ka ha nwalee ike ka ike.

Mana dịka a na-eme tụmsara n'okwu ahụ, ndị ọgba ọhụrụ na-ajụ onye bụdị Pericoma Okoye?

Kedụ onye bụ Pericoma a na-ewu?

Pericoma Okoye

Ebe foto si, Omor Perry

Pericoma Okoye bụ otiegwu Igbo ama ama n'Ala Igbo egwu ya wuru ewu n' agbata 80s na 90s.

Ọ bụrụ na ị na-anụ egwu ogene na udu a kpọrọ "Omenana na-ese okwu" na-eche onye tiri ya, mara na ị mara Pericoma site n'egwu ya.

Egwu ndị ọzọ o tiri gụnyere; "Ọgbaaghara" (1990);"High Tension"; "Ọ ga-atakụta ya aja", "Izu ka mma na nne ji"; Ị ghara Omenana mewe omenaelu".

Egwu ya bụ egwu na-ejupụta n'ilu, ịnya isi na okwu miri emi. Iji maa atụ, "Onye sị na ọ bụrụ ya, ọ bụrụ ya o mee gịnị?"; Ọ bịara egbu anyị, je egbu onwe ya"; Nne ewu tawa ahụ, akịrịka na mma atụ ya ọgụ"

Ọ na-ejikwa egwu ya etu ndị ọgaranya Igbo aha.

Onye Arondizuogu dị n'okpuru ọchịchị Ideatọ, Imo steeti, Pericoma bụ onye mmasị ya n'ọdịnala Igbo ka ewu ewu karịdịa egwu ya.

A ma ya dịka 'Mezuo Mbụ nke Arọndizuogu' maka nke a.

Omor Perry

Ebe foto si, Omor Perry

Nkọwa foto, Omor Perry n'akwamozu nna ya bú Pericoma

Iji kọwaa nke a, Nwaeze Onyekaba Emmanuel Odenigbo sị na, "Pericoma bụ nnukwu arụsị dị na ụdị mmadụ."

Odenigbo, onye ji Bob Marley tụnyere Pericoma n'iti egwu sị na ọ bụ otiegwu Chineke nyere ike pụrụ iche.

"Chineke ya nyere ya ike, o jikwa ya akpakwa ike."

O kwukwara na Pericoma bụ "ọgbaọgụ nwanne."

Ebube Izuogu

Ebe foto si, Prince Perry

Nkọwa foto, Ebube Izuogu bụ nwa Pericomo na-eti egwu ọdịnala

"I nwee mmekpa ahụ n'ebe ị na-azụ ahịa bịa kpesara ya, ọ ga esoro gị gaa lụọ ọgụ ahụ."

Ọtụtụ ndị mmadụ maara Pericoma bụ onye a mụrụ n'afọ 1948 "Arụsị Makaja Mbụ nke Arondiizuọgụ."

Ọtụtụ na-atụkwa ya egwu n'ihi akụkọ ihe arịbaama nakwa ihe miri emi odogwu a kpọrọ 'agụ nke Afrịka' na-eme.

Nke kachasị wuo nke o jikwara gụọ egwu bụ akụkọ etu ndị ụtụisi si jide ya n'Upper Iweka n' Ọnicha.

Akụkọ a dịka akụkọ ifo kwuru na ndị a bụ ndị amaghị na ọ bụ Pericoma buliri ya elu ka ha buru ya gawa n'ụlọọrụ ha mana aka ha tọrọ n'elu dịka ha enweghị ike ibutu ya.

Skip Twitter post, 1
Hapụ Twitter ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

End of Twitter post, 1

Ọ bụ oge ha wetara ọtụtụ ihe onyinye were medaa ya obi ka ha nwetara onwe ha.

Mana ụfọdụ amaghị na nwaamadị a ahụ bụ onye ihe ejije. O soro mee ihe ejije Nollywood a kpọrọ "Lion of Africa' nke ya na Pete Odochie soro mee.

Na nkọwa ihe e ji echeta Pericoma, onye ọzọ si Arondizuọgụ bụ Charles Kanu sị na, " Ọ na-eti mmọnwụ, ọ na-eri na mmọnwụ. "

Kanu gara n'ihu kwuo na "a na-anụ aha ya dịka onye katara ahụ n'Arondizuogu na ala Igbo gbaa gburugburu."

Speed Darlington, nwa Pericoma

Ebe foto si, speeddarlingtv/Instagram

Nkọwa foto, Otiegwu Speed Darlington , onye a ma dịka "Akpị" bụ nwa Pericoma Okoye

"O siri ike mmadụ. Ọ bụ nwa dịbịa e nweghị dịbịa ga-amali ya aka."

Mana o nwere mgbe a kọrọ akụkọ na Pericoma chegharịrị dịka o tiri egwu ụka, "Ụnụ ekwela ka eduhie ụnụ ".

Mana Odenigbo bụ onye ya na ya rụkọọ ọrụ egwu kọwara na ọ bụ ahịa ka ọ na-ere.

" 'Marketer' ya na ya na-arụkọ ọrụ gwara ya ka ọ kụo egwu ahụ iji ree ahịa."

Pericoma lụrụ ọtụtụ nwaanyị ma mụkwa ọtụtụ.

Omor Perry

Ebe foto si, Omor Perry

Nkọwa foto, Omor Perry bụ nwa Pericoma ihe omenala na-amasị nke ukwu

Na agbanyeghị na ọ nwụrụ abalị iri na isii nke ọnwa Febụwarị afọ 2017, ụfọdụ ụmụ ya na-agbaso ụkpụrụ ya; Speed Darlington na Ebube Izuogu ( Prince Perry) na-eti egwu, ebe Omor Perry na Fenfe Pericoma Johnbosco nwere mmasị na ihe omenala.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: